Filtra per genere

Igbo Proverbs, Idioms & Phrases

Igbo Proverbs, Idioms & Phrases

Blossom Ozurumba

A 2-minute podcast that you can quickly and easily listen to that will ideally share one Igbo Language Proverb, Idiom, or Phrase, provide the literal meaning and the figurative explanation while suggesting the most applicable English language equivalent.

5 - E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ
0:00 / 0:00
1x
  • 5 - E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ

    Date: August 15, 2022

    Podcast Title:E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ
    Season 01|Episode 04
    Episode title and number: IPIP S01E04

     

    Summary of episode:

    Igbo bụ Igbo, mma mma nụ!. N’ụbọchi nke taa n'Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, anyị ga-ekwu maka inwe obi ekele. Ọ bụ ihe ọṅụ na ndi mmadụ kwupụtara ma gosipụta ka obi dị ha nyegara ndi mmadụ ibe ya karịsịa mgbe ha nọ n’etiti anyi. Ndụ adighi adigide. Biko, kelee ma kwanyere ndị mmadụ ugwu, maka echi di ime, onweghi onye ma ihe ọ ga amụ.

    Host: Mụ nwa, Blossom Ozurumba, na-anabata gị dịka oge niile. Ngwa, were ilu nke ga abara gi uru...

    Igbo: E ree oké ọkpa nọ n'ógbè, agbataobi amara na itete ụra bu ọrụ.

    Literal Translation: Na ikọwa ya n'okwu bekee, nke a pụtara, “When the neighborhood rooster is sold in the market square, the entire neighbours will finally know that it takes some effort to wake up daily, on time.”

    English Language Equivalent: Ngwa were otu ọmụmatụ odidi ya na asụsụ bekee, “You never know what you have until you lose it, and once you lose it, you would never get it back”.

    Sponsor:

    Cheta n’ọbụ ndi otu Igbo Wikimedians User Group wetere unu ya bụ Igbo proverbs, idioms and phrases. Biko gaa na www.wikimediaigbo.org ka ikpọtụrụ ha ma kelee ha maka nkwado ha.

    Call to Action: Maka ihe ndi ọzọ gbasara usoro nke Igbo proverbs, idioms and phrases, biko gaa na www.igbopip.com ka imara ha n'uju. Ndewo ndi ọma pụrụ iche.

    Sat, 20 Aug 2022
  • 4 - E gbuo dike n'ọgụ ụlọ, ụbọchị ọgụ ezi bịara, a chọwa dike

    Date: August 08, 2022

    Podcast Title:E gbuo dike n'ọgụ ụlọ, ụbọchị ọgụ ezi bịara, a chọwa dike | Season 01|Episode 03

    Episode title and number: IPIP S01E03

    Summary of episode:

    Igbo bụ Igbo, mma mma nụ!. N’ụbọchi nke taa n'Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, anyị ga-ekwu maka ichebe ihe gbasara gi karịsịa ebe ezinaụlo gi di. Ọ di mma ka ichebe ha n'uju ma kwalite mgbaghara mgbe ha mejọrọ gi. Maka na ọ buru na i weta ndị ara nke gi ka e gbuo ha, mgbe oge ara ruru, i gaghi-enwe onye ara ọ bula fọduru ichebe gi n'aka ndi-ara wetere gi ara-ha.

    Host: Mụ, Blossom Ozurumba, na-anabata gị dịka oge niile. Ngwa, were ilu nke ụbọchi taa...

    Igbo: E gbuo dike n'ọgụ ụlọ, ụbọchị ọgụ ezi bịara, a chọwa dike.

    Literal Translation: Na ikọwa ya n'okwu bekee, nke a pụtara, “If you kill a warrior during skirmishes at home, you will remember the warrior when war and fighting comes.”

    English Language Equivalent: Ngwa were otu ọmụmatụ odidi ya na asụsụ bekee, “blood is thicker than water.

    Sponsor:

    Cheta n’ọbụ ndi otu Igbo Wikimedians User Group wetere unu ya bụ Igbo proverbs, idioms and phrases. Biko gaa na www.wikimediaigbo.org ka ikpọtụrụ ha ma kelee ha maka nkwado ha. 

    Call to Action: Maka ihe ndi ọzọ gbasara usoro nke Igbo proverbs, idioms and phrases, biko gaa na www.igbopip.com ka imara ha n'uju. Ndewo ndi ọma pụrụ iche.

    English Transcript:

    Greeting to the very distinguished Igbo people. Today on Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, we will talk about about protecting your affairs especially where your family members are concerned. It is better to protect them fully and promote forgiveness when they wrong you. Because if you bring your own lunatics to be killed, when the time of madness comes, you will not have any lunatics left to protect you from the lunatics who brought you their madness.

    I, Blossom Ozurumba, welcomes you as always. Now, take today's proverb...

    Igbo: E gbuo dike n'ọgụ ụlọ, ụbọchị ọgụ ezi bịara, a chọwa dike.

    Literal Translation: If you kill a warrior during skirmishes at home, you will remember the warrior when when war and fighting comes.

    English Language Equivalent: Blood is thicker than water.

    Sponsor:

    Igbo proverbs, idioms and phrases is brought to you by the Igbo Wikimedians User Group. Please visit www.wikimediaigbo.org to contact them and thank them for their support

    Call to Action: For more information on Igbo proverbs, idioms and phrases, please visit www.igbopip.com to know more. I celebrate you all.

    Mon, 01 Aug 2022
  • 3 - Onye ndidi n’eri azụ ukpo

    Igbo ndi ọma pụrụ iche, ndeewo nu. N’ụbọchi nke taaa na Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, anyị ga-ekwu maka ndidi. Ndidi bụ ikike nke mmadụ nwere iji nwayọọ na-edi ihe mgbu na ọnọdụ ndị siri ike. Ọ pụtakwara ikike ịnakwere igbu oge, nsogbu, ma ọ bụ nhụjuanya na-enweghị iwe ma ọ bụ nchegbu.

    Greeting to the very distinguished Igbo people. Today on Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, we will talk about patience. Patience is a person's ability to calmly endure pain and difficult situations. It also means the ability to accept delays, problems, or suffering without anger or worry.

    Mon, 01 Aug 2022
  • 2 - Onye wetere ọji, wetere ndụ

    Igbo bụ Igbo, mma mma nụ! N’ụbọchi nke taaa na Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, anyị ga-ekwu maka Ọji. Ndị Igbo na-ejikọta Ọji na ndụ n'onwe ya maka ọ n’egosipụta ịhụnanya, ịdị n'otu, nsọpụrụ, udo na ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Onye nyere mmadụ ibe ya ndụ hụrụ ya n’anya. Nke a pụtara n’inye mmadụ ibe gi ọjị n’egosi ihụnanya.

    Greetings! Today on Igbo Proverbs, Idioms and Phrases, we will be talking about the kola nut. The Igbo People associate the kola nut with life itself as it symbolises love, unity, honor, peace and so much more. The individual that offers life to another loves the person. This signifies that offering kola nut to another expresses love.

    Mon, 25 Jul 2022
  • 1 - Ndeewo

    Intro: Ndeewo ndi ọma pụrụ iche. Ana m anabata unu n'usoro nke Igbo proverbs, idioms and phrases. Ebea ka anyi ga ekwuputa ụfọdụ ilu, akpaalaokwu na nkebi okwu nke di n'asụsụ Igbo.

    Anyi ga eji nkeji abụọ n'atufughi oge, kwuputa otu ilu, akpaalaokwu ma ọ bụ nkebi okwu na asụsụ Igbo, kọwaa ya n'okwu bekee ma nyekwa ọmụmatụ nke odidi ya na asụsụ bekee.

    Sponsor:Ọ bụ ndi otu Igbo Wikimedians User Group di na obodo Naijiriya na ewetara unu ya bụ Igbo proverbs, idioms and phrases. Biko gaa na www.wikimediaigbo.org ka ikpọtụrụ ha ma kelee ha maka nkwado ha.

    Host: Ọ bụ mụ, Blossom Ozurumba n'anabata unu n'usoro nkea. Biko were oche ma nyem nti gi maka na oge eruola. Nnọọ.

    Call to action: Maka ihe ndi ọzọ gbasara usoro nke Igbo proverbs, idioms and phrases, biko gaa na www.igbopip.com ka imara ha n'uju. Ndeewo nu.

    Mon, 18 Jul 2022